7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina, nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.
8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile, ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị. Ị gbakụtara m azụ, yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị, ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ, imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.
9Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.
10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.
11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a? Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu? Ị naghị echetakwa m, ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị? Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niile ka i ji hapụ ịtụ m egwu?