Aịzaya 57

Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.

Isaiah 57:17 (UKJV) For the iniquity of his covetousness was I angry, and stroke him: I hid me, and was angry, and he went on perversely in the way of his heart.

15Nʼihi ihe a ka onye dị elu, onye e mere ka ọ dị ukwuu, onye dị mgbe ebighị ebi, onye aha ya dị nsọ kwuru: “Ebi m nʼebe dị elu nke dịkwa nsọ, ibinyere onye dị umeala nʼobi, na onye wedara mmụọ ya nʼala, itute mmụọ nke onye e wedara nʼala, na ịkpọlite mmụọ nke onye dị umeala nʼobi.

16Nʼihi na ọ bụghị ruo ebighị ebi ka m ga na-emegide gị, maọbụ na-egosi iwe m. Ọ bụrụ na m emee otu a, mmụọ ndị mmadụ ụwa niile ga-ada mba, ya na mkpụrụobi niile ahụ m ji aka m kpụọ.

17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.

18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.

19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.