17Ewesoro m ha iwe nʼihi mmehie ha na oke ọchịchọ ha. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ji taa ha ahụhụ, gbakụtakwa ha azụ. Ma lee, ha nọgidesikwara ike na-eme mmehie, na-eme ihe ọbụla nke na-atọ obi ha ụtọ.
18Ahụla m ihe niile ha mere ma aga m agwọ ha. Aga m edu ha, kasịekwa ndị na-eru ụjụ nʼIzrel obi.
19Aga m eme ka abụ otuto dị nʼegbugbere ọnụ ha. Udo, udo, dịrị ndị nọ nso na ndị nọ nʼebe dị anya,” ka Onyenwe anyị kwuru. “Aga m agwọkwa ha.”
20Ma ndị niile na-emebi iwu dị ka oke osimiri na-amagharị amagharị, nke na-adịghị ezu ike mgbe ọbụla. Ọ na-amapụtakwa ụrọ na apịtị.
21“Ọ dịkwaghị udo dịrị onye na-emebi iwu,” ka Chineke kwuru.