Aịzaya 59

Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.

Isaiah 59:16 (UKJV) And he saw that there was no man, and wondered that there was no intercessor: therefore his arm brought salvation unto him; and his righteousness, it sustained him.

14Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.

15E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.

16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.

17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.

18Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.