Aịzaya 59

E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.

Isaiah 59:15 (UKJV) Yea, truth fails; and he that departs from evil makes himself a prey: and the LORD saw it, and it displeased him that there was no judgment.

13Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị Onyenwe anyị; anyị esitela nʼiso Onyenwe anyị Chineke anyị wezuga onwe anyị, nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi. Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta.

14Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.

15E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.

16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.

17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.