Aịzaya 59

Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.

Isaiah 59:17 (UKJV) For he put on righteousness as a breastplate, and an helmet of salvation upon his head; and he put on the garments of vengeance for clothing, and was clad with zeal as a cloak.

15E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.

16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị.

17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.

18Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.

19Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị, sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya. Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.