Aịzaya 64

Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!

Isaiah 64:1 (UKJV) Oh that you would rend the heavens, that you would come down, that the mountains might flow down at your presence,

1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!

2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi, na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ. Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị, meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.

3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya ya ka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.