Aịzaya 66

Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

Isaiah 66:2 (UKJV) For all those things has mine hand made, and all those things have been, says the LORD: but to this man will I look, even to him that is poor and of a contrite spirit, and trembles at my word.

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m? Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”

2Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.

3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.

4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.