Jeremaya 11

“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.

Jeremiah 11:14 (UKJV) Therefore pray not you for this people, neither lift up a cry or prayer for them: for I will not hear them in the time that they cry unto me for their trouble.

12Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha.

13Gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dị iche iche dịka obodo dị nʼime gị si dị ọtụtụ. Ebe ịchụ aja i wukwara nʼihi ịchụrụ chi ahụ na-eweta ihere bụ Baal aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, dịkwa ọtụtụ dịka okporoụzọ dị na Jerusalem.’

14“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.

15“Gịnị ka onye m hụrụ nʼanya na-eme nʼime ụlọnsọ ukwuu m, mgbe ya na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejikọta onwe ha nʼotu ịtụ atụmatụ ihe ọjọọ? Anụ e doro nsọ apụghị ime ka ahụhụ unu kwesiri ịnata hapụ ịbịakwasị unu. A sị na o si otu a dịrị, mgbe ahụ, unu pụrụ ịṅụrị ọṅụ mgbe unu na-eme ihe ọjọọ unu.”

16Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.