Jeremaya 13

A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.

Jeremiah 13:19 (UKJV) The cities of the south shall be shut up, and none shall open them: Judah shall be carried away captive all of it, it shall be wholly carried away captive.

17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.

18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”

19A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.

20Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?

21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.