24“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ, nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.
25Nke a bụ ihe unu fetara na nza, oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Nʼihi na unu echefuola m, tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.
26Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu, si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.
27Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị, na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile! Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile, nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa. Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem! Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”