2“Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.”
3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.
4“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”
5Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
6“Ma ndị ukwu na ndị nta nʼime ha ga-anwụ nʼala a. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ruo ụjụ nʼihi ha. O nweghị onye ga-akpụcha isi ya, maọbụ gbuo onwe ya mma nʼihi ha.