Jeremaya 17

Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.

Jeremiah 17:14 (UKJV) Heal me, O LORD, and I shall be healed; save me, and I shall be saved: for you are my praise.

12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite, ka ebe nsọ anyị bụ.

13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.

14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.

15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”

16Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.