Jeremaya 17

Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.

Jeremiah 17:16 (UKJV) As for me, I have not hastened from being a pastor to follow you: neither have I desired the woeful day; you know: that which came out of my lips was right before you.

14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ. Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara, nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.

15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m, “Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị? Ya mezuonụ ugbu a!”

16Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m. Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba. Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.

17A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.

18Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.