1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.
2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.
3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.
4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”