Jeremaya 17

Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.

Jeremiah 17:3 (UKJV) O my mountain in the field, I will give your substance and all your treasures to the spoil, and your high places for sin, throughout all your borders.

1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.

2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.

3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.

4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”

5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.