Jeremaya 17

Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”

Jeremiah 17:4 (UKJV) And you, even yourself, shall discontinue from yours heritage that I gave you; and I will cause you to serve yours enemies in the land which you know not: for all of you have kindled a fire in mine anger, which shall burn for ever.

2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha, na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera, nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ, ma nʼelu ugwu nta niile.

3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ, na ihe niile ha nwere, na akụnụba ha ka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha. Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu, nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.

4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”

5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi, onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka, onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu. Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya. Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara, nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.