Jeremaya 21

Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.

Jeremiah 21:9 (UKJV) He that abides in this city shall die by the sword, and by the famine, and by the pestilence: but he that goes out, and falls to the Chaldeans that besiege you, he shall live, and his life shall be unto him for a prey.

7Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’

8“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ.

9Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya.

10Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’

11“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.