Jeremaya 23

“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 23:1 (UKJV) Woe be unto the pastors that destroy and scatter the sheep of my pasture! says the LORD.

1“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

2Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.