Jeremaya 26

Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.

Jeremiah 26:13 (UKJV) Therefore now amend your ways and your doings, and obey the voice of the LORD your God; and the LORD will repent him of the evil that he has pronounced against you.

11Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị amụma gwara ndịisi ọchịchị ahụ okwu sị ha: “O kwesiri ka a maa nwoke a ikpe ọnwụ, nʼihi na o buru amụma megide obodo a. Unu onwe unu ji ntị unu nụrụ ihe o kwuru.”

12Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu.

13Ma ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu zie ezi, ọ bụrụ na unu erube isi nye Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ o zubere na ọ ga-abịakwasị unu ghara ịbịakwasị unu.

14Ma nʼebe mụ onwe m nọ, lee adị m unu nʼaka, jirinụ m mee ihe ọbụla ziri unu ezi nʼanya nke dịkwa mma nʼanya unu.

15Ma ghọtakwanụ nke ọma, na ọ bụrụ na unu emee ka m nwụọ, unu ga-eweta ikpe ọmụma nke igbu onye aka ya dị ọcha nʼisi unu. Ikpe ọmụma ga-adịkwara obodo a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na eziokwu, Onyenwe anyị zitere m ikwupụta na ntị unu okwu ndị a niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.