Jeremaya 26

“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”

Jeremiah 26:19 (UKJV) Did Hezekiah king of Judah and all Judah put him at all to death? did he not fear the LORD, and besought the LORD, and the LORD repented him of the evil which he had pronounced against them? Thus might we procure great evil against our souls.

17Ụfọdụ nʼime ndị okenye nọ nʼebe ahụ pụtara nʼihu ọha mmadụ ahụ gwa ha okwu sị,

18“Maịka onye Moreshet buru amụma nʼoge Hezekaya, bụ eze Juda. Ọ gwara ndị Juda niile, sị ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “ ‘A ga-akọgharị Zayọn dịka ala ubi. Jerusalem ga-aghọ ebe e kpokọtara nkume na ngwongwo ụlọ dakpọrọ adakpọ, ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ ga-aghọ ebe dị elu nke oke ọhịa tochiri.’

19“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”

20(Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu.

21Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.