Jeremaya 26

Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.

Jeremiah 26:21 (UKJV) And when Jehoiakim the king, with all his mighty men, and all the princes, heard his words, the king sought to put him to death: but when Urijah heard it, he was afraid, and fled, and went into Egypt;

19“Hezekaya bụ eze Juda, na ndị Juda niile, ha mere ya ka ọ nwụọ? Hezekaya ọ tụghị egwu Onyenwe anyị, rịọọ amara na ihuọma ya? Ọ bụ na Onyenwe anyị atụgharịghị uche, mee ka ihe ọjọọ o kwuru megide ya gharakwa imezu? Ma anyị na-achọ iwetara onwe anyị ihe ọjọọ nke oke mbibi.”

20(Ụraya nwa Shemaya, onye si Kiriat Jearim pụta, bụkwa onye ọzọ buru amụma site nʼaha Onyenwe anyị. Amụma o buru megide obodo a na ala a bụkwa ụdị amụma nke Jeremaya na-ebu.

21Mgbe Jehoiakim bụ eze na ndịisi ọchịchị nụrụ amụma Ụraya na-ebu, ha gbalịrị ijide ya gbuo ya, ma Ụraya nụrụ ihe ha zubere ime. Ya mere, Ụraya nụrụ ya gbapụ ọsọ gbalaa Ijipt nʼihi egwu.

22Ma eze bụ Jehoiakim, zipụrụ Elnatan nwa Akboa na ụfọdụ ndị ikom ọzọ ka ha gaa Ijipt jide Ụraya.

23Ha si nʼIjipt kpọlata Ụraya, duru ya gaa nʼihu Jehoiakim bụ eze, onye nyere iwu ka e jiri mma agha gbuo ya. A tụnyere ozu ya nʼebe a na-eli ndị mmadụ efu nʼala ahụ.)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.