Jeremaya 26

Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.

Jeremiah 26:3 (UKJV) If so be they will hearken, and turn every man from his evil way, that I may repent me of the evil, which I purpose to do unto them because of the evil of their doings.

1Na mmalite oge ahụ, Jehoiakim nwa Josaya eze Juda bidoro ịchị ndị Juda, Onyenwe anyị mere ka okwu ya rute Jeremaya ntị.

2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.

3Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.

4Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu.

5Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị),

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.