3Ma eleghị anya ha ga-anụ, si na mmehie ha chegharịa. Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-eme ka ihe ọjọọ ahụ m na-ezube na ọ ga-abịakwasị ha ghara ịbịakwasị ha.
4Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụrụ na unu ajụ ige m ntị, jụkwa ịgbaso iwu m, nke m nyere unu.
5Ọ bụrụkwa na unu ajụ ige ntị nʼokwu ndị ohu m bụ ndị amụma ahụ m ziteere unu site nʼoge ruo nʼoge (ndị unu nọgidekwara jụ ige ntị),
6mgbe ahụ, aga m eme ka ụlọnsọ a dịrị ka Shaịlo. Aga m emekwa ka obodo a bụrụ obodo a bụrụ ọnụ nʼetiti mba niile dị nʼụwa.’ ”
7Ndị nchụaja, na ndị amụma, na ndị mmadụ ndị ọzọ nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nụrụ mgbe Jeremaya kwuru okwu ndị a niile.