Jeremaya 3

Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.

Jeremiah 3:12 (UKJV) Go and proclaim these words toward the north, and say, Return, you backsliding Israel, says the LORD; and I will not cause mine anger to fall upon you: for I am merciful, says the LORD, and I will not keep anger for ever.

10Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.

12Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.

13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

14“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.