11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Izrel na-adaghachi azụ na-egosi onwe ya nʼonye ezi omume karịa Juda onye na-aghọ aghụghọ.
12Gaa, kwusaa ozi a nʼụzọ ugwu, na-asị, “ ‘Lọta, gị Izrel nke na-ekwesighị ntụkwasị obi,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewesokwa gị iwe ọzọ, nʼihi na abụ m onye obi ebere,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘Agaghị m ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.
13Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
14“Lọghachinụ unu ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, sị, “nʼihi abụ m di unu. M ga-ahọrọ unu, otu onye site nʼotu obodo na mmadụ abụọ site nʼotu agbụrụ. M ga-akpọghachi unu Zayọn.
15Mgbe ahụ, aga m enye unu ndị ọzụzụ atụrụ masịrị m, ndị ga-eji amamihe na nghọta duo unu.