Jeremaya 3

“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.

Jeremiah 3:2 (UKJV) Lift up yours eyes unto the high places, and see where you have not been lien with. In the ways have you sat for them, as the Arabian in the wilderness; and you have polluted the land with your whoredoms and with your wickedness.

1“Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m, nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ, di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ? Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu? Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko, ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?” otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.

2“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.

3Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.

4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.