2“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a, olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko? Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko, na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara. Ị werela ịkwa iko gị niile na ihe ọjọọ gị merụọ ala a.
3Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.
4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m, ‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.
5Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile? Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’ Otu a ka unu si ekwu okwu, ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”
6Ozi a, nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta, rutere m aka nʼoge eze Josaya na-achị. Lee ihe ọ gwara m. “Ị hụla ihe Izrel na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eme? Ọ gaala nʼelu ugwu ọbụla dị elu nakwa nʼokpuru osisi ndụ ọbụla, na-akwa iko nʼebe ahụ.