Jeremaya 30

Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.

Jeremiah 30:14 (UKJV) All your lovers have forgotten you; they seek you not; for I have wounded you with the wound of an enemy, with the chastisement of a cruel one, for the multitude of yours iniquity; because your sins were increased.

12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.

13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.

14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.

15Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, na nʼihi ọtụtụ mmehie gị.

16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.