Jeremaya 30

“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.

Jeremiah 30:12 (UKJV) For thus says the LORD, Your bruise is incurable, and your wound is grievous.

10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.

11Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. ‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri, ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’

12“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwukwara, “ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala.

13O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị.

14Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, mmehie gị dịkwa ọtụtụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.