Jeremaya 30

“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

Jeremiah 30:18 (UKJV) Thus says the LORD; Behold, I will bring again the captivity of Jacob's tents, and have mercy on his dwelling places; and the city shall be built upon her own heap, and the palace shall remain after the manner thereof.

16“ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha.

17Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. ‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’

18“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu ya; aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya; ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya.

19Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, ha agaghị adịkwa ole na ole. Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, ndị a na-agaghị eledakwa anya.

20Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.