5“Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, nke oke egwu, ọ bụghị udo.
6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.