6Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?
7Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, ma a ga-anapụta ya site na ya.
8“ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, tibisikwaa agbụ niile e kere ha. Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
9Kama ha ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke ha, na Devid eze ha, onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha.
10“ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Atụkwala ụjọ gị Izrel,’ Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ.