Jeremaya 31

Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.

Jeremiah 31:5 (UKJV) You shall yet plant vines upon the mountains of Samaria: the planters shall plant, and shall eat them as common things.

3Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.

4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.

5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.

6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”

7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.