Jeremaya 31

Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’

Jeremiah 31:7 (UKJV) For thus says the LORD; Sing with gladness for Jacob, and shout among the chief of the nations: publish all of you, praise all of you, and say, O LORD, save your people, the remnant of Israel.

5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.

6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”

7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’

8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!

9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.