1Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,
2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ.
3Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn.
4“ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha;
5ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”