Jeremaya 44

Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”

Jeremiah 44:23 (UKJV) Because all of you have burned incense, and because all of you have sinned against the LORD, and have not obeyed the voice of the LORD, nor walked in his law, nor in his statutes, nor in his testimonies; therefore this evil is happened unto you, as at this day.

21“Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.

22Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.

23Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”

24Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.

25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.