Jeremaya 44

Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.

Jeremiah 44:8 (UKJV) In that all of you provoke me unto wrath with the works of your hands, burning incense unto other gods in the land of Egypt, where all of you be gone to dwell, that all of you might cut yourselves off, and that all of you might be a curse and a reproach among all the nations of the earth?

6Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.

7“Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.

8Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.

9Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?

10Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.