9Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.
12Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
13Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.