7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
8Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
9Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
10“Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
11“Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.