20E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
21Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
22Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
23Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
24Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.