23Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
24Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.
25E bipụla mpi Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
26“Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?