27Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?
28Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.