Jeremaya 48

Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.

Jeremiah 48:31 (UKJV) Therefore will I wail for Moab, and I will cry out for all Moab; mine heart shall mourn for the men of Kirheres.

29“Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.

30Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

31Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.

32Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.

33Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.