Jeremaya 48

Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 48:38 (UKJV) There shall be lamentation generally upon all the housetops of Moab, and in the streets thereof: for I have broken Moab like a vessel wherein is no pleasure, says the LORD.

36“Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.

37A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.

38Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

39“Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”

40Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.