45“Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.
46Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
47“Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.