Jeremaya 49

Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?

Jeremiah 49:1 (UKJV) Concerning the Ammonites, thus says the LORD; Has Israel no sons? has he no heir? why then does their king inherit Gad, and his people dwell in his cities?

1Nke a dịrị ndị Amọn: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ na Izrel enweghị ụmụ ndị ikom? Izrel o nweghị onye nnweta ihe o nwere? Gịnị mere Molek ji nweta obodo Gad? Gịnị mere ndị ya ji bichie obodo ya niile?

2Ma ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka a nụ ụda iti mkpu agha, nke a ga-eti megide Raba, obodo ndị Amọn. A ga-eme ya ka ọ ghọọ mkputamkpu ebe. A ga-esurekwa ya ọkụ, ya na obodo nta niile gbara ya gburugburu. Mgbe ahụ Izrel ga-achụpụkwa ndị ahụ niile chụpụrụ ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

3“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.