3Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
4A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
5Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
6Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
7Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.