Jeremaya 49

“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

Jeremiah 49:19 (UKJV) Behold, he shall come up like a lion from the swelling of Jordan against the habitation of the strong: but I will suddenly make him run away from her: and who is a chosen man, that I may appoint over her? for who is like me? and who will appoint me the time? and who is that shepherd that will stand before me?

17“Edọm ga-aghọ ihe iju anya. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile.

18Dịka a kwaturu Sọdọm na Gọmọra, ya na obodo niile gbara ya gburugburu. Otu a kwa, ọ dịghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ; nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

19“Aga m esi nʼala ya chụpụ Edọm nʼotu ntabi anya, dịka mgbe ọdụm na-esi nʼoke ọhịa Jọdan na-arịgopụta nʼebe ịta nri nke ụmụ anụmanụ jupụtara nʼahịhịa ndụ. Ma onye bụ onye ahụ a họpụtara, onye m ga-enyefe ọrụ a nʼaka ya? Onye dịka m? Onye kwa pụrụ ịpụta tụọ m aka nʼihu? Onye bụkwa onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke pụrụ ido onwe ya megide m?”

20Nʼihi nke a, nụrụ ihe Onyenwe anyị kwadobere megide Edọm, nụrụkwa ihe o zubere megide ndị bi na Teman. A ga-adọkpụrụ ndị dị nta nʼetiti igwe ewu na atụrụ ahụ, ebe ịta nri ha ga-anọ nʼọnọdụ mgbagwoju anya nʼihi nke a.

21Ụwa ga-ama jijiji mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọdịda ha; iti mkpu akwa ha ga-adakwa ụda ruo nʼOsimiri Uhie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.