Jeremaya 49

“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

Jeremiah 49:33 (UKJV) And Hazor shall be a dwelling for dragons, and a desolation for ever: there shall no man abide there, nor any son of man dwell in it.

31“Bilienụ, gaa buso mba ahụ agha, bụ mba ahụ na-ebi na ntụkwasị obi,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mba nke na-enweghị ibo ọnụ ụzọ, maọbụ mkpọrọ e ji akpọchi ya, mba ahụ nke ndị ya na-ebiri naanị onwe ha.

32Ịnyịnya kamel ha ga-abụ ihe a ga-akwata nʼagha, ọtụtụ igwe ehi ha ga-abụkwa ihe a ga-alụta nʼagha. Aga m efesa ha nye ifufe, bụ ndị niile nọ ebe dị anya, bụ ndị ahụ niile na-akpụchapụ agịrị isi egedege ihu ha. Aga m emekwa ka ihe ọjọọ si nʼakụkụ niile bịakwasị ha,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

33“Mgbe ahụ, Hazọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa. Ọ ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. O nweghị onye ọbụla ga-ebi nʼebe ahụ, nwa mmadụ ọbụla agakwaghị ebi nʼime ya.”

34Nke a bụ okwu Onyenwe anyị ndị ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere Elam, mgbe Zedekaya eze Juda bidoro ọchịchị ya.

35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m agbaji ụta nke Elam, bụ ụta ahụ ha ji anya isi na ọ bụ ebe ike ha dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.